SOLUDO MERE NYOCHA OKPORO-ỤZỌ ỌZỌ DI NA ISUANIOCHA, OKPUNO, AWKA NA NNEWI.

0 148
CBN

Site na aka Christian ABURIME

 

Ndị Okpuno, Isu, Awka na Nnewi dị n’Awka South, Awka North na Nnewi North dị n’otu n’otu na-enwe atụmanya akụ na ụba na-enwu enwu, ka Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo mere nyocha ụfọdụ okporo ụzọ ndị dara ada.

 

CBN

Ụzọ ndị dị na ebe a gara, na-aghọ ahụmahụ na-adịghị mma nye ndị ọkwọ ụgbọala na ụmụ amaala nke mpaghara ndị a

 

Mgbe ọ na-ekwu okwu oge ya na ndị bịara ịnabata ya na ime ya nlegharị anya, Gọvanọ Soludo kwere nkwa ịrụzi ma wukwa okporo ụzọ ga-adịte aka nke ga-emetụta ndụ akụnaụba obodo Anambra steeti.

 

Ụzọ a kapịrị ọnụ gara aga gụnyere okporo ụzọ dị na Nodu-Okpuno dị na Awka South Council Area, okporo ụzọ Ifiteisu-Isuaniocha dị n’Awka North nakwa Otolo-Nnewi na Nnewi North Council.

 

Gọvanọ Soludo kọwakwara na ọbịbịa a bụ n’ikwekọ n’ikwe nkwa mkpọsa o kwere ndị mmadụ, dịka otu n’ime usoro iji kwalite akụ na ụba, ibelata ahụhụ na ime ka ndụ Ndi Anambra na-atọkwu ụtọ.

 

Ebe ọ na-ekwu na ọbịbịa ahụ ga-enyere ya aka ịchọpụta ihe a ga-eme n’ụzọ ndị ahụ, ọ gara n’ihu kọwa na ọchịchị ya na-agba mbọ n’isi ọrụ ya na akwụkwọ akụkọ ya, na-arịọ ndị mmadụ nkwado.

 

Ndị mmadụ na ndị bi na mpaghara ahụ gara n’ihu gosipụtara ekele dị ukwuu nye Gọvanọ Soludo maka iwere ụzọ pụta inyocha ụzọ n’onwe ya.

A ga-echeta na ọchịchị dị ugbu a n’okpuru Gọvanọ Soludo na-elekwasị anya n’ịkwado okporo ụzọ karịrị kilomita 220 tupu afọ agwụ. Ugbu a, ihe dị ka kilomita 120 nke okporo ụzọ ewepụlarị ọkọlọtọ

 

Ndị isi ọchịchị ndị ọzọ so Gọvanọ Soludo na nlele ahụ gụnyere: osote aka na-achị steeti Anambra, Dọkịnta Onyekachukwu Ibezim, ode akwụkwọ gọọmentị steeti ahụ, Prof. Solo Chukwulobelu, onye isi ndị ọrụ na Gọvanọ, Maazị Ernest Ezeajughi, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ. Engr. Ifeanyi Okoma, onye ogbo ya (Special Duties)Barista Sly Ezeokenwa, (Chief of Protocol) Chinedu Nwoye, osote onye ozi nye Governor (Special Adviser to the Governor on Entertainment, Leisure and Tourism) Mr Bob Manuel Udokwu, (Special Adviser on Legal) Barrister Tochukwu Nweke na ndị ọzọ.

0 0 votes
Article Rating
Subscribe
Notify of
guest
0 Comments
Inline Feedbacks
View all comments
0
Would love your thoughts, please comment.x
()
x