SOLUDO KELERE CHIIFU EMEKA ANYAOKU NA NCHETA ỌMỤMỤ YA (ỊRỊ ITOOLU)

0 122
CBN

Aka na-achị Steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, CFR kelere Chief Emeka Anyaoku, GCVO, CFR, CON (Adazie Obosi), onye jibu ọkwa odeakwụkwọ ukwu (Commonwealth) na oge mbụ, Chief Emeka Anyaoku, GCVO, CFR, CON (Adazie Obosi). Ọgbara afọ iri itoolu (90) taa bụ Jenụwarị iri asatọ, afọ puku abụọ na ịrị abụọ na atọ.

 

Na ozi ya, Ọkammụta Soludo kelere ya ma kọwa Chief Emeka Anyaoku dịka onye nwere ọgụgụ isi na onye nnọchi anya mba ụwa nke gosipụtara nnukwu ịdị uchu n’ọrụ ya wee rụpụta ihe pụtara ìhè kwesịrị ịja mma.

 

CBN

Gọvanọ ahụ kwuru na ịgba afọ iri itolu bụ ihe kwesiri ka eto ma nye Chineke ekele maka amara ya na nchekwa ya. Ọ gbakwụnyere na ya bụ onye jibu ọkwa ode akwụkwọ ukwu bụ rụsiri ọrụ ya ike na mba ụwa, ala Nigeria nakwa Obodo ya.

 

Gọvanọ Soludo chetakwara mmemme mmepe dị iche iche e mere n’oge ọ nọ n’ọchịchị Commonwealth, ọkachasị ọrụ pụrụiche ọ rụrụ na mgba maka nnwere onwe, ikpe ziri ezi na ọchịchị onye kwuo uche ya na kọntinent Africa na gburugburu ụwa.

 

Mgbe ọ na-achọ onye ahụ na-eme ememe ọtụtụ afọ obi ụtọ na-abịa n’ihu, Gọvanọ Soludo kpere ekpere ka Chineke nye ya ezi ahụike na amamihe ka ọ gaa n’ihu na-ejere ụmụ mmadụ ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye.

 

 

Christian Aburime

Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi nye Gọvanọ

 

Ọnwa Mbụ Jenụwarị abalị iri na asatọ, afọ puku abụọ na ịrị abụọ na atọ.

 

Onye dere ozi a n’igbo bụ Nwaada (Ezeh Ijeoma)

0 0 votes
Article Rating
Subscribe
Notify of
guest
0 Comments
Inline Feedbacks
View all comments
0
Would love your thoughts, please comment.x
()
x