SOLUDO NA-EKELE NDI MUSLIMI N’EID-EL-MAULUD

0 219
CBN

Gọvanọ Anambra steeti bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, CFR kelere ndị ụka Alakụba ka ha na-eme mmemme Eid-el-Maulud nke bụ ụbọchị ọmụmụ onye amụma Mohammed.

 

“Dịka mmemme ewepụtara iji cheta ọmụmụ onye amụma Mohammed, ana m ekele ndị Alakụba na Naịjirịa na n’ụwa niile n’ịkwado ụbọchị a dị oke mkpa.” Gọvanọ Soludo kwuru

 

CBN

“Mmemme a na-akpọ anyị ka anyị tụgharịa uche miri emi ọzọ na ndụ ihe atụ nke onye amụma dị nsọ na ozi ịhụnanya, udo, ndidi na ikpe ziri ezi.”

 

“N’oge a pụrụ iche, a na m akpọku ndị mmadụ ka ha ṅomie ndụ onye amụma a site n’ịkwalite àgwà ọma nke ịhụnanya, ndidi, ikpe ziri ezi na ịdị n’udo n’ọchịchọ anyị iji wulite obodo na-adịghị mma na nke dị n’otu.” Gọvanọ Soludo kwukwara

 

Gọvanọ ahụ jikwa ohere ahụ kpọkuo Ndi Anambra ka ha na ọchịchị ya jikọrọ aka wee wulite ala nna dị ndụ na nke ọma, site n’ịkwalite iwu na usoro oge niile.

 

Christian Aburime

Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi nye Gọvanọ. 

Onye dere ozi a n’Igbo bu (Ezeh ijeoma)

0 0 votes
Article Rating
Subscribe
Notify of
guest
0 Comments
Oldest
Newest Most Voted
Inline Feedbacks
View all comments
0
Would love your thoughts, please comment.x
()
x