SOLUDO kelere otu arụmụka ANAMBARA maka mmeri onye isi ala nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị

0 167
CBN

Site Na aka Christian ABURIME

 

Gọvanọ Anambara steeti bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, kelere ndị otu ndọrọndọrọ ụka Anambara bụ ndị meriri n’asọmpị arụmụka nke onyeisiala bụ ndi isi Umu akwukwo.

 

CBN

Asọmpi arụmụka nke Onye isi ala umu akwukwo bụ asọmpi arụmụka kwa afọ nke ndị isi oche na-ahazi site na arụmụka ụlọ akwụkwọ Onye isi ala Nigeriaa maka steeti niile n’ofe mba ahụ.

 

Gọvanọ Soludo kọwara ihe ịga nke ọma ụmụ akwụkwọ nwetara dị ka akụkọ ọzọ dị mma na-esi na steeti Anambara pụta bụ Ìhè nke mba.

 

“Anyị niile na-enwe obi ụtọ maka otu ahụ maka ọmarịcha arụmọrụ a. Obi dị m ụtọ na n’ihi ya, ha ga-emecha gawa Vietnam, bịa afo iri abuo na iri ato , ịnọchite anya Nigeriaa na asọmpi arụmụka nke ụlọ akwụkwọ ụwa.

 

“Imeri steeti niile sonyere na mbido mbụ na ihu ndị otu na obodo Nassarawa ihu n’asọmpị ikpeazụ iji pụta nke kacha mma kwesịrị ịja mma.

 

“Nke a bụ mmụọ ịdị mma nke Anambara n’ọrụ, obi dịkwa m ụtọ na mbọ anyị na-agba n’ihu n’ịkwalite mmụta na steeti ahụ ji nke nta nke nta na-amịpụta mkpụrụ osisi a chọrọ.

 

“Ana m eme ememe kpọmkwem Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ, Prọfesọ Ngozi Chuma-Udeh, ndị otu ya na ndị nnọchiteanya arụmụka maka ime Steeti mpako,” Gọvanọ kwukwara.

“N’ụbọchị na-abịa, ndị nkuzi anyị ewepụtara ọhụrụ ga-aga n’ụlọ akwụkwọ anyị dịka akụkụ nke mbọ ọchịchị m na-agba iji kwụsị oge ụlọ akwụkwọ na-enweghị ndị nkuzi na steeti ahụ.

 

Gọvanọ Soludo kwukwara, “Anyị ga-aga n’ihu na-ekwusi ike na mkpebi anyị imeziwanye ogo ndị nkuzi na nkuzi dịka ntọala maka mmepe. Anyị ga-agbasi mbọ ike na nke a,” Gọvanọ Soludo kwukwara.

 

Onye tuyariri ozi a n’Igbo bu (Ezeh Ijeoma) ozi na enwetara gi si na ulo oru mgbasa ozi

0 0 votes
Article Rating
Subscribe
Notify of
guest
0 Comments
Oldest
Newest Most Voted
Inline Feedbacks
View all comments
0
Would love your thoughts, please comment.x
()
x